23. Mb͕e Ọ batara n'ub͕ọ, ndi nēso uzọ-Ya we so Ya.
24. Ma le, oké ajọ ifufe febe n'oké osimiri, ya mere ebili-miri nēkpuchi ub͕ọ-ha: ma Ya onwe-ya nāraru ura.
25. Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Onye-nwe-ayi, zọputa ayi; ayi nāla n'iyì.
26. O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ, unu ndi okwukwe ntà? Mb͕e ahu O biliri, bara ifufe na oké osimiri ahu nba; oké ndaju we di.
27. Ibobo we nwua ndi ahu n'aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?
28. Mb͕e Ọ gabigasiri n'ofè ọzọ n'ala ndi Gadara, ndikom abua ndi mọ ọjọ ji we zute Ya, ndi nēsi n'ebe anēlì ozu puta, ndi anya-ha di oké egwu, ya mere ọ dighi onye ọ bula nwere ike igabiga uzọ ahu.
29. Ma le, ha tiri nkpu, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Gi Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mb͕e oge-ayi akērughi?
30. Ma ìgwè nke ọtutu ezì di n'ebe di anya n'ebe ha nọ, nāta nri.
31. Ndi-mọ ọjọ ahu we riọ Ya, si, Ọ buru na I chupuru ayi, ziga ayi nime ìgwè ezì ahu.