Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 5:9-24 Bible Nso (IGBOB)

9. Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.

10. Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n'ihi ezi omume: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu.

11. Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim.

12. Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ.

13. Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu.

14. Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu.

15. Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu.

16. Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.

17. Unu echèla na abiaram imebi iwu Chineke ma-ọbu ndi-amuma-Ya: abiaghm imebi, kama imezu ya.

18. N'ihi na n'ezie asim unu, Rue mb͕e elu-igwe na ala gāgabiga, ọ dighi otù ihe ọ bula dikarisiri ntà gāgabiga n'iwu ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme.

19. Ya mere onye ọ bula nke gēmebi otù nime ihe ndia dikarisiri ntà nke enyere n'iwu, nke gēzí kwa madu otú ahu, agākpọ ya onye dikarisiri ntà n'ala-eze elu-igwe: ma onye ọ bula nke gēme ha, zí kwa ha, onye ahu ka agākpọ onye uku n'ala-eze elu-igwe.

20. N'ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adighi-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli.

21. Unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Eb͕ula madu; ma onye ọ bula nke b͕uru madu gēnye onwe-ya n'aka ikpé:

22. ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.

23. Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n'iru Chineke n'ebe-ichu-àjà, i we cheta n'ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi,

24. rapu onyinye-gi n'ebe ahu n'iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n'udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 5