Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 3:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma na mb͕e ahu Jọn Baptist biara, nēkwusa n'ọhia nke Judia,

2. si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

3. N'ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n'ọnu Aisaia onye-amuma, si,Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

4. Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.

5. Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya;

6. ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.

7. Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?

8. Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu;

9. unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.

10. Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

11. Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n'azum kam ike, Onye m'nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 3