55. Ọtutu ndinyom nọ kwa n'ebe ahu ndi nọ n'ebe di anya nēkiri, ndi si na Galili soro Jisus, nējere Ya ozi:
56. n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Joses, na nne umu Zebedi, nọ.
57. Ma mb͕e o ruru anyasi, otù ọgaranya, aha-ya bu Josef, onye ya onwe-ya bu kwa onye nēso uzọ Jisus, si n'Arimatia bia:
58. nwoke a jekuru Pailat, riọ aru Jisus. Mb͕e ahu Pailat nyere iwu ka ewere ya nye n'aka-ya.
59. Josef we būru aru ahu, ke ya n'ezi ákwà ọcha nēnwu enwu,
60. tọb͕ọ ya n'ílì ọhu nke aka ya, nke o gwuwarari n'oké nkume: o we kpọre otù nkume uku kwachie ọnu-uzọ ílì ahu, we la.
61. Ma Meri Magdalini na Meri ọzọ nọ n'ebe ahu, nānọdu na ncherita-iru ílì ahu.
62. Ma n'echi-ya, nke bu ubọchi so ubọchi Nkwadebe, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi zukọrọ jekuru Pailat,