52. ílì meghe-kwa-ra; ewe me ka aru ọtutu ndi di nsọ ndi raruri ura si n'ọnwu bilie;
53. ha we si n'ebe anēlì ozu puta mb͕e nbilite-n'ọnwu-Ya gasiri, we ba n'obodo nsọ, were onwe-ha gosi ọtutu madu.
54. Ma ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, na ndi ha na ya nọ nēche Jisus, mb͕e ha huru ala-ọma-jijiji ahu, na ihe nile emere, ha tua egwu ri nne, si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.
55. Ọtutu ndinyom nọ kwa n'ebe ahu ndi nọ n'ebe di anya nēkiri, ndi si na Galili soro Jisus, nējere Ya ozi:
56. n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Joses, na nne umu Zebedi, nọ.
57. Ma mb͕e o ruru anyasi, otù ọgaranya, aha-ya bu Josef, onye ya onwe-ya bu kwa onye nēso uzọ Jisus, si n'Arimatia bia:
58. nwoke a jekuru Pailat, riọ aru Jisus. Mb͕e ahu Pailat nyere iwu ka ewere ya nye n'aka-ya.
59. Josef we būru aru ahu, ke ya n'ezi ákwà ọcha nēnwu enwu,
60. tọb͕ọ ya n'ílì ọhu nke aka ya, nke o gwuwarari n'oké nkume: o we kpọre otù nkume uku kwachie ọnu-uzọ ílì ahu, we la.