Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 27:22-30 Bible Nso (IGBOB)

22. Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n'obe.

23. O we si, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n'obe.

24. Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu.

25. Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi.

26. Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe.

27. Mb͕e ahu ndi-agha nke onye-isi kuru Jisus tiyere onwe-ha ba na Pritoriọm, ha we me ka òtù-ha dum zukọ n'ebe Ọ nọ.

28. Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie.

29. Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju!

30. Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n'isi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 27