26. Mb͕e ha nēri ihe, Jisus we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya; O we nye ndi nēso uzọ-Ya, si, Naranu, rie; nka bu arum.
27. O we nara iko, kele kwa, we nye ha, si, Unu nile ṅua nime ya;
28. n'ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie.
29. Ma asim unu, M'gaghi-aṅu ma-ọli site n'ub͕u a n'ihe a si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n'ala-eze Nnam.
30. Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.
31. Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.
32. Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili.
33. Ma Pita zara, si Ya, Ọ buru na agēme madu nile ka ha ma n'ọnyà n'aru Gi, agaghi-eme ka mu onwem ma n'ọnyà mb͕e ọ bula.
34. Jisus si ya, N'ezie asim i, na n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá, i gāgọnarim ub͕ò atọ.
35. Pita si Ya, Ọ buru na ọ di nkpà ọbuná ka m'so Gi nwua, agaghm-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ndi ahu nile ndi nēso uzọ-Ya kwuru.
36. Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'gēje n'ebe ahu kpe ekpere.
37. O we kuru Pita na umu Zebedi abua tiyere Onwe-ya, o we malite iwuta Ya n'obi, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri.
38. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, som nēche nche.
39. O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.
40. O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Ùnu di otú a nēnweghi ike isom che nche otù oge hour?
41. Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike.