Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 24:11-24 Bible Nso (IGBOB)

11. Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.

12. N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi.

13. Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.

14. Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.

15. Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),

16. mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:

17. onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:

18. onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.

19. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.

20. Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n'ubọchi-izu-ike:

21. n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.

22. Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi.

23. Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a, ma-ọbu, N'ebe a; unu ekwela.

24. N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 24