9. Ya mere, ganu n'ab͕ata uzọ nile, ka ha ra kwa, bú ndi unu gāhu, kpọ ha bia n'oriri ọlulu-nwunye nkem.
10. Ndi-orù ahu we pua ga n'uzọ nile, me ka madu nile ha huru zukọ, ka ha ra, ma ajọ madu ma ezi madu: ulo anālu nwunye we juputa na ndi nọduru na nri.
11. Ma mb͕e eze ahu batara ikiri ndi nọduru na nri, ọ hu n'ebe ahu otù nwoke nke nēyighi uwe ọlulu-nwunye:
12. o we si ya, Eyìm, ì si aṅa bata n'ebe a nēyighi uwe ọlulu-nwunye? Ma o kpuchiri ọnu.
13. Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.
14. N'ihi na ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na -ole.
15. Mb͕e ahu ndi-Farisi gara, we b͕a ìzù otú ha gēme ka Ọ ma n'ọnyà n'okwu.
16. Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru.
17. Ya mere, gwa ayi, Gini bu uche-Gi? Ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma -ọbu na ò zighi ezi?
18. Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua?
19. Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling.
20. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya?
21. Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.
22. Mb͕e ha nuru ya, o we ju ha anya, ha we rapu Ya, je nke ha.
23. N'ubọchi ahu ndi-Sadusi biakutere Ya nāsi na nbilite-n'ọnwu adigh: ha we jua Ya,
24. si, Onye-ozizí, Moses siri, Ọ buru na nwoke anwua, nēnweghi umu, nwa-nne-ya nwoke gālu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe nwunye-ya nọ, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.
25. Ma umu-nne-ndikom asa di n'etiti ayi: nke-mbu luru nwunye, we nwua, ma ebe ọ nēnweghi nkpuru ọ rapuru nwunye-ya nye nwa-nne-ya;
26. otú a ka nke-abua me-kwa-ra, nke-atọ kwa, rue nke-asa.