17. Ya mere, gwa ayi, Gini bu uche-Gi? Ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma -ọbu na ò zighi ezi?
18. Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua?
19. Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling.
20. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya?