Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 22:15-31 Bible Nso (IGBOB)

15. Mb͕e ahu ndi-Farisi gara, we b͕a ìzù otú ha gēme ka Ọ ma n'ọnyà n'okwu.

16. Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru.

17. Ya mere, gwa ayi, Gini bu uche-Gi? Ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma -ọbu na ò zighi ezi?

18. Ma Jisus mara ajọ ihe-ha, Ọ si, Gini mere unu nānwam, ndi-iru-abua?

19. Gosinum ego nke ùtú. Ha we wetara Ya otù shilling.

20. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya?

21. Ha si Ya, Sisa nwe. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.

22. Mb͕e ha nuru ya, o we ju ha anya, ha we rapu Ya, je nke ha.

23. N'ubọchi ahu ndi-Sadusi biakutere Ya nāsi na nbilite-n'ọnwu adigh: ha we jua Ya,

24. si, Onye-ozizí, Moses siri, Ọ buru na nwoke anwua, nēnweghi umu, nwa-nne-ya nwoke gālu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe nwunye-ya nọ, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

25. Ma umu-nne-ndikom asa di n'etiti ayi: nke-mbu luru nwunye, we nwua, ma ebe ọ nēnweghi nkpuru ọ rapuru nwunye-ya nye nwa-nne-ya;

26. otú a ka nke-abua me-kwa-ra, nke-atọ kwa, rue nke-asa.

27. Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwu-kwa-ra.

28. Ya mere, na nbilite-n'ọnwu nwùnye onye n'etiti ha asa ka ọ gābu? n'ihi na ha nile nwere ya na nwunye.

29. Ma Jisus zara, si ha, Unu nēhie uzọ, ebe unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke.

30. N'ihi na nime nbilite-n'ọnwu ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di, kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe.

31. Ma n'okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ùnu agughi okwu Chineke gwara unu, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 22