Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 20:7-20 Bible Nso (IGBOB)

7. Ha si ya, N'ihi na ọ dighi onye ọ bula goro ayi ilu ọlu. Ọ si ha, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem.

8. Ma mb͕e o ruru anyasi, onye-nwe ubi-vine ahu si onye o tiyere ihe-ya n'aka, Kpọ ndi-ọlu ahu, kwua ha ugwọ-ọlu-ha, malite site na ndi-ikpe-azu rue ndi bu uzọ.

9. Mb͕e ndi egoro n'oge hour nke-iri-na-otù biara, ha we nata otù onye otù shilling.

10. Ma mb͕e ndi bu uzọ biara, ha chère na ha gānata nke ka; ma ha onwe-ha nata-kwa-ra otù onye otù shilling.

11. Ma mb͕e ha natara ya, ha tamube megide nna-nwe-ulo ahu,

12. si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku.

13. Ma ọ zara otù onye nime ha, si, Eyìm, emejọghm i: mù na gi enweghi otù olu ka m'nye gi otù shilling?

14. Welie nke bu nke gi, la; anamachọ ka m'nye onye-ikpe-azu a dika m'nye-kwa-ra gi.

15. Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu?

16. Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu.

17. Mb͕e Jisus nārigoro Jerusalem, O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu iche, bú ndi nēso uzọ-Ya, tiyere Onwe-ya, O we si ha n'uzọ,

18. Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpé ọnwu,

19. rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.

20. Mb͕e ahu nne umu Zebedi biakutere Ya, ya na umu-ya ndikom, nākpọ isi ala nye Ya, nāriọ kwa Ya ihe n'aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 20