Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 20:29-34 Bible Nso (IGBOB)

29. Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya.

30. Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.

31. Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.

32. Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?

33. Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi.

34. Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 20