5. Ma unu onwe-unu nāsi, Onye ọ bula nke gāsi nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu ihe enyere Chineke;
6. ọ gaghi-asọpuru nna-ya ma-ọbu nne-ya ma-ọli. Unu nēme kwa okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu n'ihi ozizí enyere unu n'aka idebe.
7. Ndi-iru-abua, Aisaia buru amuma nke-ọma bayere unu, si,
8. Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha;Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.
9. Ma ha nēbirim isi ala n'efu,Nēzì ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.
10. O we kpọ ìgwè madu ahu biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu, ghọta-kwa-nu:
11. Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu.
12. Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si Ya, Ì matawo na emere ka ndi-Farisi ma n'ọnyà, mb͕e ha nuru okwu ahu?
13. Ma Ọ zara, si, Agēropu ihe-ọkukú ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākughi.
14. Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.