Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 14:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n'etiti, o we tọ Herod utọ.

7. N'ihi ya o were iṅu-iyi kwe nkwa inye ya ihe ọ bula ọ gāriọ.

8. Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a.

9. O we wuta eze ahu n'obi: ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi ya na ha nọduru na nri, o nyere iwu ka ewere ya nye ya;

10. o we ziga, bipu isi Jọn n'ulo-nkpọrọ.

11. Ewe bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya.

12. Ndi nēso uzọ-ya we bia, būru ozu-ya, lì kwa ya; ha we je kọrọ Jisus.

13. Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala.

14. O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike.

15. Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n'obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri.

16. Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie.

17. Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 14