Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 13:1-18 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri.

2. Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú.

3. O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;

4. mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha:

5. nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6. ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7. Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.

8. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

9. Onye nwere nti, ya nu.

10. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu?

11. O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.

12. N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

13. N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa.

14. Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si,N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:

15. N'ihi na obi ndi nka mara abuba,Nti-ha kpọchi-kwa-ra,Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.

16. Ma ngọzi nādiri anya-unu, n'ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n'ihi na ha nānu ihe.

17. N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.

18. Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 13