Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 9:22-29 Bible Nso (IGBOB)

22. Ọtutu mb͕e ọ tubà-kwa-ra ya n'ọku na nime miri, ila ya n'iyì: ma ọ buru na I puru ime ihe, nwe ọmiko n'aru ayi, nyere ayi aka.

23. Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.

24. Ngwa ngwa nna nwatakiri ahu tiri nkpu, si, Ekwem; nyere ekweghi-ekwem aka.

25. Ma mb͕e Jisus huru na ìgwè madu nāb͕akọta, Ọ bara mọ ahu nādighi ọcha nba, si ya, Gi mọ nādighi-ekwu okwu na nke nti chiri, Mu onwem nēnye gi iwu, si nime ya puta, abà-kwa-la nime ya ọzọ.

26. Mb͕e o tisiri nkpu, sesi kwa ya ike, o we puta: nwa ahu we di ka ozu; ya mere ndi ka nime ha si, Ọ nwuruwo.

27. Ma Jisus jidere ya n'aka, palie ya elu; o we bilie.

28. Mb͕e Ọ batara n'ulo-ha, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya iche, si, Gini mere ayi onwe-ayi apughi ichupu mọ ahu?

29. O we si ha, Aha mọ nka apughi iputa site n'ihe ọ bula, ma-ọbughi site n'ekpere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 9