Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 7:34-37 Bible Nso (IGBOB)

34. O we le anya n'elu-igwe, sua udè, si ya, Efata, nke isi-ya bu, Ghere oghe.

35. Nti-ya abua we ghere oghe, ekike ire-ya tọpu kwa, o we kwuzi okwu.

36. O we gwasie ha ike ka ha ghara igwa onye ọ bula: ma ka ọ ra, bú otú Ya onwe-ya gwasiri ha ike, otú a ka ha nēkwusa kari ya nke-uku.

37. Ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, ha si, O mewo ihe nile nke-ọma: Ọ nēme ọbuná ndi nti chiri ka ha nu ihe, me kwa ndi nāpughi ikwu okwu ka ha kwue.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 7