Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 6:4-14 Bible Nso (IGBOB)

4. Jisus we si ha, Onye-amuma abughi onye adighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'etiti ikwu-ya, na n'ulo-ya.

5. Ọ pughi kwa ilu ọlu di ike ọ bula n'ebe ahu, ma-ọbughi na O bikwasiri ndi-nriaria ole-na-ole aka-Ya abua, we me ka aru di ha ike.

6. Ekweghi-ekwe-ha we ju Ya anya.Ọ nējeghari kwa obodo ntà nile ha buruburu nēzí ihe.

7. Ọ we kpọ ndi-ozi iri na abua ahu biakute Ya, O we malite izipu ha abua abua; O nye-kwa-ra ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ;

8. O we nye ha iwu ka ha ghara iwere ihe ọ bula n'ije-ha, ma-ọbughi nání nkpa-n'aka; ka ha ghara iwere ob͕e achicha, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ego n'ihe-ọkiké-ha;

9. ma ka ha je nēyi akpukpọ-ukwu sandal: Ọ si ha, Unu eyi-kwa-la uwe-ime abua.

10. O we si ha, Ebe ọ bula unu gābà n'ulo, nọgide n'ulo ahu rue mb͕e unu putara n'ebe ahu.

11. Ma ebe ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, ebe ha anughi kwa okwu-unu, mb͕e unu nāpu n'ebe ahu, tichapu ájá di n'okpuru ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.

12. Ha we pua, kwusa ka madu chègharia.

13. Ha nāchupu kwa ọtutu mọ ọjọ, were kwa manu olive te ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike.

14. Herod, bú eze, we nu, n'ihi na aha-Ya putara ìhè: o we si, Jọn onye nēme baptism, emewo ka o si na ndi nwuru anwu bilie, n'ihi nke à ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 6