Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 6:38-46 Bible Nso (IGBOB)

38. Ọ si ha, Òb͕e achicha ole ka unu nwere? jenu, le. Mb͕e ha mara, ha si, Ise, na azù abua.

39. O we gwa ha ka madu nile nọdu ala n'òtù di iche iche n'elu ahihia ndu.

40. Ha we nọdu ala n'ahiri di iche iche, ọgu ise ọgu ise, na ọgu abua na iri ọgu abua na iri.

41. O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa ob͕e achicha ahu; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ndi ahu; O we kère ha nile azù abua ahu.

42. Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha.

43. Ha we tutukọ iberibe nile, njuputa nkata iri na abua, na nke azù abua ahu.

44. Ma ndi riri ob͕e achicha ise ahu bu nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri.

45. Ngwa ngwa o we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ na Betsaida, mb͕e Ya onwe-ya nēzilaga ìgwè madu ahu.

46. Mb͕e O kelesiri ha, O jere n'ugwu ahu ikpe ekpere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 6