Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 6:28-46 Bible Nso (IGBOB)

28. we bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we nye ya nne-ya.

29. Mb͕e ndi nēso uzọ-ya nuru ya, ha we bia būru ozu-ya, tọb͕ọ ya n'ílì.

30. Ndi-ozi Jisus we zukọ n'ebe Jisus nọ; ha we kọrọ Ya ihe nile, ka ihe ha mere ra, ka ihe ha ziri ra kwa.

31. O we si ha, Unu onwe-unu bia ichè n'ebe bu ọhia, ka unu zuru ike nke-ntà. N'ihi na ọtutu madu nābia nāla kwa, oghere adighi kwa ha ọbuná iri ihe.

32. Ha we je n'ub͕ọ-ha iche rue ebe bu ọhia.

33. Ma ọtutu madu huru ha mb͕e ha nēje, ha mata-kwa-ra ha, we si n'obodo ahu nile b͕akọta n'ebe ahu n'ukwu ala, buru ha uzọ.

34. O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, n'ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe.

35. Mb͕e chi nēji nb͕u a, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Ebe a bu ọhia, chi nēji kwa ub͕u a:

36. zilaga ha, ka ha we je n'ubi na obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe ha gēri.

37. Ma Ọ zara, si ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si Ya, Àyi gēe izuta ob͕e achicha nke ọgu shilling iri, nye ha ka ha rie?

38. Ọ si ha, Òb͕e achicha ole ka unu nwere? jenu, le. Mb͕e ha mara, ha si, Ise, na azù abua.

39. O we gwa ha ka madu nile nọdu ala n'òtù di iche iche n'elu ahihia ndu.

40. Ha we nọdu ala n'ahiri di iche iche, ọgu ise ọgu ise, na ọgu abua na iri ọgu abua na iri.

41. O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa ob͕e achicha ahu; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ndi ahu; O we kère ha nile azù abua ahu.

42. Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha.

43. Ha we tutukọ iberibe nile, njuputa nkata iri na abua, na nke azù abua ahu.

44. Ma ndi riri ob͕e achicha ise ahu bu nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri.

45. Ngwa ngwa o we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ na Betsaida, mb͕e Ya onwe-ya nēzilaga ìgwè madu ahu.

46. Mb͕e O kelesiri ha, O jere n'ugwu ahu ikpe ekpere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 6