18. ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.
19. Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke.
20. Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n'ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n'ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.