isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 16 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri, Meri Magdalini, na Meri nne James, na Salomi, we zuta uda utọ di iche iche, ka ha we bia te Ya manu.

2. N'isi-ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, ha we bia rue ílì-Ya mb͕e anyanwu wara.

3. Ha we sirita onwe-ha, Ònye gākpọrepuru ayi nkume ahu n'ọnu-uzọ ílì?

4. Mb͕e ha lere anya n'elu, ha we hu na akpọreghachiwo nkume ahu: n'ihi na o riri nne nke-uku.

5. Ha we ba n'ílì, hu nwa-okorọbia ka ọ nọduru n'aka-nri, b͕okwasi kwa uwe-nwuda ọcha; ibobo we nwua ha n'aru nke-uku.

6. Ma ọ si ha, Ka ibobo ghara inwu unu n'aru nke-uku: unu nāchọ Jisus, Onye Nazaret, Onye akpọgideworo n'obe: emere ka O si n'ọnwu bilie; Ọ nọghi n'ebe a: le, ebe ha tọb͕ọrọ Ya!

7. Kama labanu, si ndi nēso uzọ-Ya na Pita, O buru unu uzọ ga Galili: n'ebe ahu ka unu gāhu Ya, dika Ọ gwara unu.

8. Ha we pua, si n'ílì ahu b͕alaga; n'ihi na ọma-jijiji na njubiga-anya-ókè nānwu ha n'aru: ha agwaghi kwa onye ọ bula ihe ọ bula; n'ihi na ha nātu egwu.

9. Ma mb͕e O siri n'ọnwu bilie n'ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, O buru uzọ were Onwe-ya gosi Meri Magdalini, onye Ọ chupururi mọ ọjọ asa nime ya.

10. Nwanyi ahu we ga kọrọ ndi Ya na ha nọri, mb͕e ha nēru újú nākwa kwa ákwá.

11. Ma mb͕e ndi ahu nuru na Ọ di ndu, na ya onwe-ya hu-kwa-ra Ya-ri, ha ekweghi.

12. Ma mb͕e ihe ndia gasiri emere ka Ọ puta ìhè nye madu abua nime ha n'udi di iche, mb͕e ha nēje ije, nāga n'azu obodo.

13. Ndi ahu we je kọrọ ndi fọduru: ha ekweghi kwa okwu-ha.

14. Emesia emere ka Ọ puta ìhè nye ndi-ozi iri na otù onwe-ha mb͕e ha nọduru na nri; O we ta ekweghi-ekwe-ha na obi-etili-ha uta, n'ihi na ha ekweghi okwu ndi huru Ya mb͕e emesiri ka O si n'ọnwu bilie.

15. O we si ha, Ganu n'uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem.

16. Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé.

17. Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche;

18. ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.

19. Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke.

20. Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n'ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n'ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.