15. O we si ha, Ganu n'uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem.
16. Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé.
17. Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche;
18. ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.