Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 16:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri, Meri Magdalini, na Meri nne James, na Salomi, we zuta uda utọ di iche iche, ka ha we bia te Ya manu.

2. N'isi-ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, ha we bia rue ílì-Ya mb͕e anyanwu wara.

3. Ha we sirita onwe-ha, Ònye gākpọrepuru ayi nkume ahu n'ọnu-uzọ ílì?

4. Mb͕e ha lere anya n'elu, ha we hu na akpọreghachiwo nkume ahu: n'ihi na o riri nne nke-uku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 16