Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 9:21-30 Bible Nso (IGBOB)

21. Ma Ọ dọrọ ha aka na nti, nye kwa ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe a;

22. si, Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, aghaghi ib͕u kwa Ya, na ime kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.

23. O we si ha nile, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya kwa-ubọchi, nēsokwam.

24. N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọpuita ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, onye ahu gāzọputa ya.

25. N'ihi na ùrù gini ka ọ nābara madu, ma ọ buru na o rita uwa dum n'urù, o we tufue ma-ọbu anapu ya onwe-ya?

26. N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme, ihere onye ahu gēme Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke aka Ya, na ebube nke Nna-Ya, na ebube nke ndi-mọ-ozi-Ya di nsọ.

27. Ma asim unu n'ezie, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke.

28. O we rue mb͕e ubọchi asatọ gasiri mb͕e O kwusiri okwu ndia, na Ọ chiri Pita na Jọn na Jemes tiyere Onwe-ya, rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere.

29. Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma.

30. Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 9