Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 6:5-13 Bible Nso (IGBOB)

5. O we si ha, Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

6. O we rue n'ubọchi-izu-ike di iche, na Ọ batara n'ulo-nzukọ-ha, we nēzí ihe: otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu, aka-nri-ya kpọnwu-kwa-ra akpọnwu.

7. Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo.

8. Ma Ya onwe-ya matara ihe ha nātule n'obi; O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, guzo n'etiti. O we bilie, guzo kwa.

9. Jisus we si ha, Anamaju unu, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọ̀puta ndu, ma-ọbu ila ya n'iyì?

10. Mb͕e Ọ lesiri ha nile anya gburugburu, O we si ya, Setipu aka-gi. O we me ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di na mbu.

11. Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.

12. O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke.

13. Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 6