Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 6:4-16 Bible Nso (IGBOB)

4. otú ọ batara n'ulo Chineke, were kwa ob͕e achicha anēche n'iru Chineke rie ya, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ; nke nēzighi ezi n'iwu ka ha rie, ma nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?

5. O we si ha, Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

6. O we rue n'ubọchi-izu-ike di iche, na Ọ batara n'ulo-nzukọ-ha, we nēzí ihe: otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu, aka-nri-ya kpọnwu-kwa-ra akpọnwu.

7. Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo.

8. Ma Ya onwe-ya matara ihe ha nātule n'obi; O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, guzo n'etiti. O we bilie, guzo kwa.

9. Jisus we si ha, Anamaju unu, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọ̀puta ndu, ma-ọbu ila ya n'iyì?

10. Mb͕e Ọ lesiri ha nile anya gburugburu, O we si ya, Setipu aka-gi. O we me ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di na mbu.

11. Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.

12. O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke.

13. Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi;

14. Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu,

15. na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis,

16. na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 6