Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 6:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi;

14. Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu,

15. na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis,

16. na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye;

17. O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile;

18. eme-kwa-ra ka aru-ha di ike, bú ndi mọ nādighi ọcha nēsob͕u.

19. Ìgwè madu ahu nile we chọ imetu Ya aka: n'ihi na ike nēsi n'aru-Ya puta, nēme kwa ka aru di ha nile ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 6