Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 5:4-20 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma mb͕e O kwubìri okwu, Ọ si Saimon, Nupu n'ob͕u-miri, wunyenu ihe unu ji eb͕u azù ka unu b͕ue azù.

5. Saimon we za, si, Nna-ayi, ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu ogologo abali a dum, ma ayi eb͕utaghi ihe ọ bula: ma n'okwu-Gi m'gāwuye ihe eji eb͕u azù.

6. Mb͕e ha mesiri nka, ha we nwuta oké ìgwè azù, ihe-ha eji eb͕u azù we nādọka;

7. ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n'ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu.

8. Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi.

9. N'ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n'aru;

10. otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n'aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n'ub͕u a i ganānwuta madu na ndu.

11. Mb͕e ha tinyere ubọ-ha n'ala, ha we rapu ihe nile, so Ya.

12. O rue, mb͕e Ọ nọ n'otù nime obodo ahu, le, otù nwoke nke ekpenta juputara n'aru: ma mb͕e ọ huru Jisus o da kpuchie iru-ya n'ala, riọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha.

13. O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya.

14. Ya onwe-ya we nye ya iwu ka ọ ghara igwa onye ọ bula: Ọ si kwa ya, Kama laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha, dika Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.

15. Ma okwu bayere Ya fesakariri nke-uku: oké ìgwè madu we nāb͕akọ inu okwu-Ya, ka ewe me kwa aru-ha nke nādighi nma ka ọ di ike.

16. Ma Ya onwe-ya nēwezuga Onwe-ya n'ebe bu ọhia, nēkpe kwa ekpere.

17. O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n'obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike.

18. Ma le, ndikom butere otù nwoke akuku-aru-ya nwuru anwu n'elu ihe-ndina: ha we nāchọ uzọ ibubata ya, na itọb͕ọ ya n'iru Ya.

19. Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus.

20. Mb͕e Ọ huru okwukwe-ha, Ọ si, Nwoke, ab͕agharawo gi nmehie-gi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 5