Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 5:17-31 Bible Nso (IGBOB)

17. O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n'obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike.

18. Ma le, ndikom butere otù nwoke akuku-aru-ya nwuru anwu n'elu ihe-ndina: ha we nāchọ uzọ ibubata ya, na itọb͕ọ ya n'iru Ya.

19. Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus.

20. Mb͕e Ọ huru okwukwe-ha, Ọ si, Nwoke, ab͕agharawo gi nmehie-gi nile.

21. Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite itule n'obi-ha, si, Ònye bu Nwoke a nke nēkwu okwu nkwulu? Ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi nání Chineke?

22. Ma ebe Jisus mazuru ihe ha nātule n'obi-ha, Ọ za, si ha, Gini mere unu nātule ihe n'obi-unu?

23. Òle nke ka nfé, isi, Ab͕agharawo gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa?

24. Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (Ọ si onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, laa n'ulọ gi.

25. Ngwa ngwa o we bilie n'iru ha, chiri ihe o ji dina, je ulo-ya, nēto Chineke.

26. Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke; egwu juputa-kwa-ra ha n'obi, ha si, Ayi ahuwo ihe-ebube ta.

27. Mb͕e ihe ndia gasiri Ọ pua, hu onye-ọna-utu, nke anākpọ aha-ya Livai, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú, Ọ si ya, Som.

28. O we rapu ihe nile, bilie, so Ya.

29. Livai we siere Ya nri uku n'ulo-ya iji nara Ya nke-ọma: oké ìgwè ndi-ọna-utu na ndi ọzọ di kwa ndi soro ha nọdu na nri.

30. Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ-ha we tamube imegide ndi nēso uzọ-Ya, si, N'ìhi gini ka unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia nēri ihe?

31. Jisus we za, si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi aru di nma; kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 5