Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 3:3-22 Bible Nso (IGBOB)

3. O we bia n'ala nile di Jọ̀dan gburugburu, nēkwusa baptism nke nchèghari, ka ewe b͕aghara nmehie;

4. dika edeworo ya n'akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si,Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

5. Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula,Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala;Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi,Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari;

6. Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.

7. Ya mere ọ si ìgwè madu ahu ndi biara ka ọ me ha baptism, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?

8. Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.

9. Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

10. Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?

11. O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.

12. Ndi-ọna-utu biakwara ka eme ha baptism, ha we si ya, Onye-ozizí, gini kwesiri ka ayi me?

13. Ọ si ha, Unu apunarala madu kari ihe akaworo unu.

14. Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n'ego-ọlu-unu.

15. Mb͕e ndi-Ju nọ nēle anya, mb͕e madu nile nātughari kwa n'obi-ha ihe bayere Jọn, ma eleghi anya ya onwe-ya bu Kraist ahu,

16. Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:

17. Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.

18. Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma;

19. ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere,

20. ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ.

21. Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,

22. Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 3