Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 3:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini,

2. mb͕e Anas na Kaiafas bu ndi-isi-nchu-àjà, okwu Chineke biakutere Jọn nwa Zakaraias n'ọhia.

3. O we bia n'ala nile di Jọ̀dan gburugburu, nēkwusa baptism nke nchèghari, ka ewe b͕aghara nmehie;

4. dika edeworo ya n'akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si,Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

5. Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula,Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala;Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi,Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari;

6. Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.

7. Ya mere ọ si ìgwè madu ahu ndi biara ka ọ me ha baptism, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?

8. Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.

9. Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

10. Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 3