Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 23:31-38 Bible Nso (IGBOB)

31. N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?

32. Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha.

33. Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya.

34. Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà.

35. Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara.

36. Ndi-agha we me kwa Ya ihe-ọchì, nābiakute Ya, nēche kwa n'iru Ya manya-vine b͕ara uka,

37. si, Ọ buru na Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju, zọputa Onwe-gi.

38. Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 23