Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 22:52-66 Bible Nso (IGBOB)

52. Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe?

53. Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.

54. Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n'ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n'ebe di anya.

55. Ma mb͕e ha funwuru ọku n'etiti obí, we nọdu ala n'otù, Pita we nọdu n'etiti ha.

56. Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n'ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra.

57. Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya.

58. Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim.

59. Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N'ezie nwoke a na Ya nọkwara: n'ihi na ọ bu kwa onye Galili.

60. Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá.

61. Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ.

62. O we pua, kwa ákwá nke-uku.

63. Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe.

64. Ha we kechi iru-Ya, jua Ya, si, Bue amuma: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?

65. Ọtutu ihe ọzọ ka ha kwuru megide Ya, nēkwulu Ya.

66. Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 22