isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 22 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ememe achicha ekoghi-eko, nke anakpọ Ngabiga, nēru nso.

2. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju.

3. Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu.

4. O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n'aka-ha.

5. Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego.

6. O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n'aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi.

7. Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga.

8. O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie.

9. Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie?

10. Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya.

11. Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?

12. Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu.

13. Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.

14. Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya.

15. O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu:

16. n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke.

17. O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n'etiti onwe-unu:

18. n'ihi na asim unu, M'gaghi-aṅu ihe si n'osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia.

19. O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam.

20. Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu.

21. Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n'elu table.

22. N'ihi na Nwa nke madu nāga n'ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Ya nye.

23. Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n'etiti ha gēme ihe a.

24. Esem-okwu we da kwa n'etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku.

25. O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma.

26. Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n'etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi.

27. N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi.

28. Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n'ọnwunwam nile;

29. Mu onwem nāb͕a kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam b͕ara ndu inyem,

30. ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n'ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n'oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.

31. Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka:

32. ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike.

33. O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu.

34. O we si, Asim i, Pita, oke-ọkuku agaghi-akwá ta, rue mb͕e i gāgọ ub͕ò atọ, si na i mataghim.

35. O we si ha, Mb͕e M'zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi.

36. O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha.

37. N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu.

38. Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n'ebe a. O we si ha, O zuwo.

39. O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya.

40. Ma mb͕e O ruru n'ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n'ọnwunwa.

41. Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere,

42. si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ.

43. Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike.

44. Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala.

45. Mb͕e O biliri n'ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n'ihe-nwuta,

46. O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa.

47. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu.

48. Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye?

49. Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue?

50. Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya.

51. Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike.

52. Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe?

53. Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.

54. Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n'ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n'ebe di anya.

55. Ma mb͕e ha funwuru ọku n'etiti obí, we nọdu ala n'otù, Pita we nọdu n'etiti ha.

56. Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n'ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra.

57. Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya.

58. Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim.

59. Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N'ezie nwoke a na Ya nọkwara: n'ihi na ọ bu kwa onye Galili.

60. Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá.

61. Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ.

62. O we pua, kwa ákwá nke-uku.

63. Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe.

64. Ha we kechi iru-Ya, jua Ya, si, Bue amuma: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?

65. Ọtutu ihe ọzọ ka ha kwuru megide Ya, nēkwulu Ya.

66. Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si,

67. Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist, gwa ayi. Ma Ọ siri ha, Ọ buru na Mu agwa unu, unu agaghi-ekwe ma-ọli:

68. ma ọ buru na Mu aju unu ajuju, unu agaghi-aza ma-ọli.

69. Ma site n'ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n'aka-nri nke ike Chineke.

70. Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya.

71. Ha we si, Ọ̀ bu nkpà àmà gini nākpa ayi ọzọ? n'ihi na ayi onwe-ayi nuru site n'ọnu-Ya.