Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 22:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ememe achicha ekoghi-eko, nke anakpọ Ngabiga, nēru nso.

2. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju.

3. Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu.

4. O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n'aka-ha.

5. Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego.

6. O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n'aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi.

7. Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga.

8. O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie.

9. Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie?

10. Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya.

11. Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?

12. Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu.

13. Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.

14. Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya.

15. O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu:

16. n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 22