Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 12:41-54 Bible Nso (IGBOB)

41. Pita we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu ayi ka I nāturu ilu a, ma-ọbu madu nile kwa?

42. Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n'oge-ya?

43. Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

44. N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

45. Ma ọ buru na orù ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;

46. onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi, ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, ke òkè nye ya n'etiti ndi nēkwesighi ka atukwasi ha obi.

47. Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;

48. ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.

49. Abiaram itusa ọku n'elu uwa; ma gini ka M'nāchọ, ọ buru na afunwuwo ya-ri ub͕u a?

50. Ma enwerem baptism agēji mem baptism; ọ nēb͕ukwam nb͕u n'obi nke-uku rue mb͕e agēmezu ya.

51. Ùnu nēchè na abiaram inye udo n'uwa? asim unu, É-è; kama nkewa:

52. n'ihi na site n'ub͕u a madu ise ndi kewaworo ekewa gādi n'otù ulo, madu atọ megide madu abua, madu abua megide kwa madu atọ.

53. Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya.

54. O we si kwa ìgwè madu nile, Mb͕e ọ bula unu huru igwe-oji ka o si n'Ọdida-anyanwu nārigo, ngwa ngwa unu nāsi, Nshansha-miri nābia; o were mee otua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 12