Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 11:50-54 Bible Nso (IGBOB)

50. ka ewe chọputa ọbara ndi-amuma nile, nke awusiworo site na ntọ-ala uwa, n'aka ọb͕ọ a;

51. site n'ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n'iyì n'ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n'aka ọb͕ọ a.

52. Ahuhu gādiri unu ndi-iwu; n'ihi na unu wepuru nkpisi-ugodi nke ọmuma-ihe: unu onwe-unu abataghi, unu b͕ochi-kwa-ra ndi nābata.

53. Mb͕e O siri n'ebe ahu puta, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite inọgide Ya si-ike, na ikpasu Ya ikwu okwu bayere ọtutu ihe;

54. nēche Yá anwu, inwude ihe nke gēsi n'ọnu-Ya puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 11