Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 11:40-47 Bible Nso (IGBOB)

40. Unu ndi nēnweghi uche, Onye ahu Nke mere azú iko, ọ̀ bughi Ya me-kwa-ra ime-ya?

41. Otú ọ di, werenu ihe di nime lua ọlu ebere; ihe nile di kwa ọcha n'ebe unu nọ.

42. Ma ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsi ísì utọ na rue na nkpa-akwukwọ nile, ma unu nagabiga ikpé na ihu-n'anya Chineke: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.

43. Ahuhu gādiri unu ndi-Farisi; n'ihi na unu nāhu isi oche nile n'ulo-nzukọ nile, na ekele n'ọma-ahia nile, n'anya.

44. Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu di ka ílì nke nāputaghi ìhè, nke madu ndi nējeghari n'elu ha nāmataghi ya.

45. Ma otù onye nime ndi-iwu zara, si Ya, Onye-ozizí, n'ikwu okwu a I nēme kwa ayi ihe-ihere.

46. O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n'ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu.

47. Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu nēwu ebe anēlì ndi-amuma, ma nna-unu-hà b͕uru ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 11