Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jud 1:5-18 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma anamezube ichetara unu, ọ bu ezie na unu matara ihe nile nání otù mb͕e, na Onye-nwe-ayi, mb͕e Ọ zọputarari otù ndi n'ala Ijipt, emesia O we la ndi nēkweghi ekwe n'iyì.

6. Ndi-mọ-ozi ndi nēdebeghi ibu-isi nke aka ha, kama ha rapuru ebe-obibi nke aka ha, O debewo kwa ha n'ab͕u ebighi-ebi n'okpuru ọchichiri nye ikpé nke oké ubọchi ahu.

7. Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.

8. Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n'irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n'ebube.

9. Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.

10. Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.

11. Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora.

12. Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;

13. buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n'Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu,

15. ikpe madu nile ikpé, na itu ndi nile ndi nāsọpurughi Chineke ihe n'anya, bú ọlu nile nke asọpughi-Chineke ha nke ha luru n'asọpughi-Chineke, ha na okwu di ike nile nke ndi-nmehie ndi nāsọpurughi Chineke kwugidere Ya.

16. Ndia bu ndi-ntamu, ndi nāta Chineke uta, nējeso agu ihe ọjọ nile ha (ọnu-ha nēkwu kwa oké okwu nāfuli afuli), ndi nāja iru madu n'ihi urù.

17. Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, chetanu okwu nile nke ndi-ozi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist buru uzọ kwu;

18. na ha siri unu, N'oge ikpe-azu ndi-ọchì gādi, nāga dika agu ihe ọjọ nile nke aka ha nke asọpughi-Chineke si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jud 1