1. Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus we nējeghari na Galili: n'ihi na Ọ chọghi ijeghari na Judia, n'ihi na ndi-Ju nāchọ uzọ ib͕u Ya.
2. Ma ememe ahu nke ndi-Ju, bú ememe ulo-ikwū, di nso.
3. Ya mere umu-nne-Ya siri Ya, Si n'ebe a pua, je na Judia, ka ndi nēso uzọ-Gi we hu kwa ọlu-Gi nile nke I nālu.
4. N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nēme ihe ọ bula na nzuzo, ma asi na ya onwe-ya nāchọ ka ọra madu mara ya. Ọ buru na I nēme ihe ndia, me Onwe-gi ka I puta ìhè nye uwa.
5. N'ihi na ọbuná umu-nne-Ya ekweghi na Ya.
6. Ya mere Jisus si ha, oge nkem akērughi; ma oge nke unu bu ihe edoziworo mb͕e nile.
7. Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ.
8. Rigonu onwe-unu n'ememe a: Mu onwem agaghi-arigoro ememe a ub͕u a; n'ihi na oge nkem akēzughi.
9. Ma mb͕e Ọ gwasiri ha okwu ndia, Ọ nānọgide na Galili.
10. Ma mb͕e umu-nne-Ya rigosiri ememe ahu, mb͕e ahu Ya onwe-ya rigo-kwa-ra, ọ bughi n'iru ọra madu, kama dika ọ bu na nzuzo.
11. Ya mere ndi-Ju nāchọ Ya n'ememe, nāsi, Òle ebe Onye ahu nọ?
12. Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a.
13. Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju.