Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 16:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù.

21. Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa.

22. Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.

23. N'ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n'aham.

24. Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.

25. Agwawom unu ihe ndia n'ilu: oge hour nābia, mb͕e M'nāgaghi-agwa unu okwu n'ilu ọzọ, kama M'gāgwawa unu okwu bayere Nnam.

26. N'ubọchi ahu unu gāriọ n'aham: ma asighm unu, na Mu onwem gēkpere Nnam n'ihi unu;

27. n'ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n'anya, n'ihi na unu onwe-unu huworom n'anya, kwere kwa na Mu onwem siri n'ebe Nnam nọ puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 16