Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 16:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. ezi omume, n'ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n'ub͕u a;

11. ikpé, n'ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé.

12. Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a.

13. Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.

14. Onye ahu gēto Mu onwem: n'ihi na Ọ gēwere n'ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 16