Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 13:34-38 Bible Nso (IGBOB)

34. Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya.

35. Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n'anya n'ebe ibe-unu nọ.

36. Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, Òle ebe I nāla? Jisus zara, si, Ebe M'nāla, i pughi isom ub͕u a; ma i gēsom ma emesia.

37. Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka m'nāpughi iso Gi ọbuná ub͕u a? m'gātọb͕ọ ndum n'ihi Gi.

38. Jisus zara, si, Ì gātọb͕ọ ndu-gi n'ihim? N'ezie, n'ezie, asim i, Oke-ọkuku agaghi-akwa, rue mb͕e i gāgọnarim ub͕ò atọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 13