Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 13:25-38 Bible Nso (IGBOB)

25. Onye ahu dabere, otú ọ di, n'obi Jisus, we si Ya, Onye-nwe-ayi, ònye ka ọ bu?

26. Ya mere Jisus za, si, Ọ bu onye ahu, nke Mu onwem gēsuru iberibe achicha n'ofé, nye ya. Ya mere, mb͕e O susiri iberibe achicha ahu, O were ya nye Judas, nwa Saimon Iskariot.

27. Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ.

28. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nọduru na nri mara ihe O ji gwa ya okwu a.

29. N'ihi na ufọdu nēchè, ebe Judas ji àkpà-ego, na Jisus siri ya, Zuta ihe di ayi nkpà n'ememe; ma-ọbu, ka o nye ndi-ob͕eye ihe.

30. Ya mere mb͕e ọ narasiri iberibe achicha ahu ọ pua ngwa ngwa: ma ọ bu abali.

31. Ya mere mb͕e ọ pururi, Jisus si, Ub͕u a ka enyere Nwa nke madu otuto, enye-kwa-ra Chineke otuto nime Ya;

32. Chineke gēnye kwa Ya otuto nime Onwe-ya, ngwa ngwa ka Ọ gēnye kwa Ya otuto.

33. Umu-ntakiri, ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ. Unu gāchọm: dika M'gwa-kwa-ra ndi-Ju, si, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia; otú ahu ka M'nāsi unu ub͕u a.

34. Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya.

35. Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n'anya n'ebe ibe-unu nọ.

36. Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, Òle ebe I nāla? Jisus zara, si, Ebe M'nāla, i pughi isom ub͕u a; ma i gēsom ma emesia.

37. Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka m'nāpughi iso Gi ọbuná ub͕u a? m'gātọb͕ọ ndum n'ihi Gi.

38. Jisus zara, si, Ì gātọb͕ọ ndu-gi n'ihim? N'ezie, n'ezie, asim i, Oke-ọkuku agaghi-akwa, rue mb͕e i gāgọnarim ub͕ò atọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 13