Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 1:2-19 Bible Nso (IGBOB)

2. Onye ahu na Chineke diri na mbu.

3. Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya.

4. Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu.

5. Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya.

6. Otù nwoke putara, onye ezitere site n'ebe Chineke nọ, aha-ya bu Jọn.

7. Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n'aka-ya kwere.

8. Ya onwè-ya abughi Ìhè ahu, kama ọ biara ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà.

9. Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè.

10. Ọ nọri n'uwa, ekèkwara uwa site n'aka-Ya, uwa amaghi kwa Ya.

11. Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbataghi Ya.

12. Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya:

13. ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke.

14. Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.

15. Jọn nāb͕ara Ya àmà, nēti kwa nkpu, si, Onye a bu Onye m'kwuru okwu bayere Ya, si, Onye ahu Nke nābia n'azum aghọwo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ.

16. N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara.

17. N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.

18. Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.

19. Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 1