Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jemes 5:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n'aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi.

11. Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.

12. Ma nke kachasi ihe nile, umu-nnam, unu aṅula iyí, unu ejila elu-igwe, ma-ọbu ala, ma-ọbu ihe iṅu-iyi ọ bula ọzọ, ṅu iyi: kama ka e-unu buru e, ka é-è-unu buru kwa é-è; ka unu we ghara idabà n'okpuru ikpé.

13. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere. Ọ̀ di onye ọ bula nwere obi-utọ? ya bùa abù ọma.

14. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n'isi-ya, nēte ya manu olive n'aha Onye-nwe-ayi:

15. ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādighi ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na o mehieworo, agāb͕aghara ya nmehie ahu.

16. Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.

17. Elaija bu madu yiri ayi n'aru-ya, o we kpesie ekpere ike ka miri ghara izo; miri ezoghi kwa n'ala arọ atọ na ọnwa isi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jemes 5