Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jemes 2:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Umu-nnam, unu enwela okwukwe nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Onye-nwe ebube, n'ile-madu-anya-n'iru.

2. N'ihi na asi na otù nwoke nke yiri nb͕a-aka ọla-edo na uwe mara nma nke-uku bata na nzukọ-unu, ma asi na otù ob͕eye nke yiri uwe ruru inyi bata kwa;

3. ọ buru kwa na unu ele onye ahu nke nēyi uwe mara nma nke-uku anya, si, Gi onwe-gi nọdu ala n'ebe a nke-ọma; unu we si ob͕eye ahu, Gi onwe-gi guzo n'ebe a, ma-ọbu nọdu ala n'okpuru ihe-nb͕akwasi-ukwum;

4. ùnu enweghi obi abua nime onwe-unu, ùnu aghọghi kwa ndi-ikpé nēchè èchìchè ọjọ?

5. Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?

6. Ma unu onwe-unu mere ob͕eye ahu ihe-ihere. Ǹdi-ọgaranya adighi-emeso unu dika ha bu ndi-nwe-unu? ọ̀ bughi kwa ha onwe-ha nādọkpuru unu ga ulo ikpé?

7. Ọ̀ bughi ha onwe-ha nēkwulu aha ọma ahu nke aguru unu?

8. Otú ọ di, ọ buru na unu edebezu iwu nke Eze-ayi, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si kwu, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, unu nēme nke-ọma:

9. ma ọ buru na unu ele madu anya n'iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n'ihi na iwu ahu nātu unu nmehie-unu n'anya dika ndi-njehie.

10. N'ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n'otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara.

11. N'ihi na Onye ahu Nke siri, Akwala iko, Ọ si-kwa-ra, Eb͕ula madu. Ma ọ buru na i kwaghi iko, ma i nēb͕u madu, i ghọwo onye-njehie iwu.

12. Nēkwunu otú a, nēme-kwa-nu otú a, dika ndi agaje iwere iwu nke inwe-onwe-onye kpe unu ikpé.

13. N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.

14. Ùrù gini ka ọ bara, umu-nnam, ma ọ buru na onye ọ bula asi na o nwere okwukwe, ma o nweghi ọlu? òkwukwe ahu puru izọputa ya?

15. Ọ buru na nwa-nna-nwoke ma-ọbu nwa-nna-nwanyi b͕a ọtọ, nēnweghi kwa ihe-oriri gēzuru ya kwa-ubọchi,

16. ma otù onye n'etiti unu si ha, Labanu n'udo, nyanu ọku, riju-kwa-nu afọ; ma unu enyeghi ha ihe nākpa aru-ha; ùrù gini ka ọ bara?

17. Ọbuná otú a okwukwe, ma ọ buru na o nweghi ọlu, ọ bu ihe nwuru anwu n'onwe-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jemes 2