1. Umu-nnam, unu enwela okwukwe nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Onye-nwe ebube, n'ile-madu-anya-n'iru.
2. N'ihi na asi na otù nwoke nke yiri nb͕a-aka ọla-edo na uwe mara nma nke-uku bata na nzukọ-unu, ma asi na otù ob͕eye nke yiri uwe ruru inyi bata kwa;
3. ọ buru kwa na unu ele onye ahu nke nēyi uwe mara nma nke-uku anya, si, Gi onwe-gi nọdu ala n'ebe a nke-ọma; unu we si ob͕eye ahu, Gi onwe-gi guzo n'ebe a, ma-ọbu nọdu ala n'okpuru ihe-nb͕akwasi-ukwum;
4. ùnu enweghi obi abua nime onwe-unu, ùnu aghọghi kwa ndi-ikpé nēchè èchìchè ọjọ?
5. Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?
6. Ma unu onwe-unu mere ob͕eye ahu ihe-ihere. Ǹdi-ọgaranya adighi-emeso unu dika ha bu ndi-nwe-unu? ọ̀ bughi kwa ha onwe-ha nādọkpuru unu ga ulo ikpé?
7. Ọ̀ bughi ha onwe-ha nēkwulu aha ọma ahu nke aguru unu?
8. Otú ọ di, ọ buru na unu edebezu iwu nke Eze-ayi, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si kwu, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, unu nēme nke-ọma:
9. ma ọ buru na unu ele madu anya n'iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n'ihi na iwu ahu nātu unu nmehie-unu n'anya dika ndi-njehie.
10. N'ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n'otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara.
11. N'ihi na Onye ahu Nke siri, Akwala iko, Ọ si-kwa-ra, Eb͕ula madu. Ma ọ buru na i kwaghi iko, ma i nēb͕u madu, i ghọwo onye-njehie iwu.
12. Nēkwunu otú a, nēme-kwa-nu otú a, dika ndi agaje iwere iwu nke inwe-onwe-onye kpe unu ikpé.
13. N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.
14. Ùrù gini ka ọ bara, umu-nnam, ma ọ buru na onye ọ bula asi na o nwere okwukwe, ma o nweghi ọlu? òkwukwe ahu puru izọputa ya?
15. Ọ buru na nwa-nna-nwoke ma-ọbu nwa-nna-nwanyi b͕a ọtọ, nēnweghi kwa ihe-oriri gēzuru ya kwa-ubọchi,
16. ma otù onye n'etiti unu si ha, Labanu n'udo, nyanu ọku, riju-kwa-nu afọ; ma unu enyeghi ha ihe nākpa aru-ha; ùrù gini ka ọ bara?
17. Ọbuná otú a okwukwe, ma ọ buru na o nweghi ọlu, ọ bu ihe nwuru anwu n'onwe-ya.
18. Ma otù onye gāsi, Gi onwe-gi nwere okwukwe, mu onwem nwe-kwa-ra ọlu: gosim okwukwe-gi ma ọlu-gi adighi ya, mu onwem gēsite kwa n'ọlum gosi gi okwukwem.
19. Gi onwe-gi kwere na Chineke bu otù; i nēme nke-ọma: ndi-mọ ọjọ kwe-kwa-ra, we kuja.
20. Ma ì nāchọ ka i mara, gi madu efu, na okwukwe bu ihe nādighi-aluputa ihe ma ọlu adighi ya?
21. Èsiteghi n'ọlu gu Abraham nna-ayi n'onye ezi omume, mb͕e ọ churu Aisak nwa-ya nwoke n'elu ebe-ichu-àjà?
22. I huwo na okwukwe-ya soro ọlu-ya lukọ ọlu, esite-kwa-ra n'ọlu ahu me ka okwukwe ahu zue okè;
23. ewe mezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke nāsi, Abraham we kwere okwu Chineke, ewe gua ya nye ya n'ezi omume; ewe kpọ ya eyì nke Chineke.
24. Unu ahuwo na anēsite n'ọlu gu madu n'onye ezi omume, adighi-esite kwa nání n'okwukwe.
25. Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche?
26. N'ihi na dika aru bu ihe nwuru anwu ma mọ adighi ya, ọbuná otú a okwukwe bu ihe nwuru anwu ma ọlu adighi ya.